Ọnụ Ọgụgụ
10 Jehova wee gwa Mozis, sị: 2 “Meere onwe gị opi+ ọlaọcha abụọ. Ị ga-akpụ ha akpụ, ị ga-ejikwa ha na-akpọkọta+ nzukọ ahụ, na-emekwa ka ha kwalie. 3 Ọ bụrụ na a fụọ ha abụọ, nzukọ ahụ dum ga-ezukọta n’oge a kara aka n’ebe ị nọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ 4 Ma ọ bụrụ naanị otu ka a fụrụ, ndị isi bụ́ ndị isi nke puku kwuru puku ndị Izrel ga-ezukọta n’oge a kara aka n’ebe ị nọ.+
5 “Ọ bụrụ na unu afụọ opi, ya dasitụ ike, ya adalatatụ, ndị mara ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-akwali. 6 Ọ bụrụkwa na unu afụọ opi nke ugboro abụọ, ya dasitụ ike, ya adalatatụ, ndị mara ụlọikwuu n’ebe ndịda+ ga-akwali. A ga-afụ opi a mgbe ọ bụla otu n’ime ha na-akwali.
7 “Mgbe unu chọrọ ịkpọkọta ọgbakọ ahụ, unu ga-afụ opi,+ ma ọ gaghị abụ ya dasitụ ike, ya adalatatụ. 8 Ọ bụ ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga na-afụ opi ndị ahụ,+ ịfụ ha ga-abụrụ unu ụkpụrụ nke na-adịru mgbe a na-akaghị aka n’ọgbọ niile unu.
9 “Ọ bụrụ na unu na-ebuso onye mmegbu agha n’ala unu, bụ́ onye na-awakpo unu,+ unu ga-eji opi ndị ahụ fụọ opi agha,+ a ga-echetakwa unu n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, e wee zọpụta unu n’aka ndị iro unu.+
10 “N’ụbọchị unu na-aṅụrị ọṅụ+ nakwa n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu,+ unu ga-afụ opi maka àjà nsure ọkụ+ unu nakwa àjà udo unu;+ ịfụ ha ga-abụrụ unu ihe ncheta n’ihu Chineke unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+
11 O wee ruo n’afọ nke abụọ, n’ọnwa nke abụọ, n’abalị iri abụọ n’ọnwa ahụ,+ na ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu Ihe Àmà kwụlie.+ 12 Ụmụ Izrel wee malite ịkwali n’ala ịkpa Saịnaị n’usoro ha ji akwali,+ ígwé ojii ahụ wee kwụrụ n’ala ịkpa Peran.+ 13 Ha wee malite ịkwali nke mbụ ha, dị ka Jehova nyere n’iwu site n’ọnụ Mozis.+
14 Ìgwè nke ebo atọ mejupụtara, ya bụ, ìgwè nke ụmụ Juda, wee buru ụzọ kwalie, n’ụsụụ ha,+ Nashọn+ nwa Aminadab bụ onyeisi ndị agha ya. 15 Onyeisi ndị agha nke ebo Ịsaka bụ Netanel+ nwa Zua. 16 Onyeisi ndị agha nke ebo ụmụ Zebulọn bụ Elayab nwa Hilọn.+
17 E wee tọtuo ụlọikwuu ahụ,+ ụmụ Geshọn+ na ụmụ Meraraị,+ bụ́ ndị na-ebu ụlọikwuu ahụ, wee kwalie.
18 Ìgwè nke ebo atọ mejupụtara, bụ́ ìgwè nke Ruben,+ wee kwalie, n’ụsụụ ha, Elaịzọ+ nwa Shedeọ bụkwa onyeisi ndị agha ya. 19 Onyeisi ndị agha nke ebo ụmụ Simiọn+ bụ Shelumiel+ nwa Zurishadaị. 20 Onyeisi ndị agha nke ebo ụmụ Gad bụ Elayasaf+ nwa Duel.
21 Ụmụ Kohat, bụ́ ndị na-ebu ihe ndị dị n’ebe nsọ ahụ,+ wee kwalie, n’ihi na a ga-eguzobe ụlọikwuu ahụ tupu ha abịarute.
22 Ìgwè nke ebo atọ mejupụtara, ya bụ, ìgwè nke ụmụ Ifrem,+ wee kwalie n’ụsụụ ha, Elishama+ nwa Amaịhọd bụ onyeisi ndị agha ya. 23 Onyeisi ndị agha nke ebo ụmụ Manase+ bụ Gameliel+ nwa Pedazọ. 24 Onyeisi ndị agha nke ebo ụmụ Benjamin+ bụ Abidan+ nwa Gidionaị.
25 Ìgwè nke ebo atọ mejupụtara, ya bụ, ìgwè nke ụmụ Dan,+ wee kwalie n’ụsụụ ha, ka ha bụrụ ndị na-ekpere ụmụ Izrel niile azụ,+ Ahayiza+ nwa Amishadaị bụkwa onyeisi ndị agha ya. 26 Onyeisi ndị agha nke ebo ụmụ Asha+ bụ Pegiel+ nwa Ọkran. 27 Onyeisi ndị agha nke ebo ụmụ Naftalaị+ bụ Ahaịra+ nwa Inan. 28 Ọ bụ otú a ka ụmụ Izrel si na-akwali n’ụsụụ ha mgbe ha na-akwali.+
29 Mozis wee gwa Hobab, nwa Ruel,+ onye Midian bụ́ nna nwunye Mozis, sị: “Anyị na-akwali ịga n’ebe ahụ Jehova gwara anyị okwu banyere ya, sị, ‘M ga-enye ya unu.’+ Soro anyị gaa, anyị ga-emezi gị emezi,+ n’ihi na Jehova ekwuwo na ya ga-emere Izrel ihe ọma.”+ 30 Ma ọ sịrị ya: “Agaghị m eso unu, kama m ga-ala n’ala m,+ lakwuru ndị ikwu m.” 31 O wee sị: “Biko, ahapụla anyị, n’ihi na ị ga-abụrụ anyị anya, ebe ọ bụ na ị maara nke ọma ebe anyị nwere ike ịma ụlọikwuu n’ala ịkpa. 32 Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i soro anyị,+ ee, ọ ga-erukwa na dị ka Jehova ga-ewere ịdị mma ya meere anyị ihe ọma, otú ahụ ka anyị onwe anyị ga-emere gị ihe ọma.”
33 Ha wee si n’ugwu Jehova+ jee ije ụbọchị atọ, e bukwa igbe ọgbụgba ndụ+ Jehova na-aga n’ihu ha ruo ụbọchị atọ iji chọtara ha ebe izu ike.+ 34 Ígwé ojii+ Jehova nọkwa n’elu isi ha n’ehihie ka ha si n’ebe ha mara ụlọikwuu na-apụ.
35 Ọ na-erukwa na mgbe Igbe ahụ malitere njem, Mozis na-asị: “Jehova, biko, bilie chụsasịa ndị iro gị;+ ka ndị kpọrọ gị oké asị sikwa n’ihu gị gbaa ọsọ.”+ 36 Mgbe ọ kwụsịkwara otu ebe, ọ na-asị: “Jehova, biko, lọghachikwute puku kwuru puku ndị Izrel.”+