12 Gị onwe gị asịwokwa, ‘N’ezie, m ga-emeso gị ihe n’ụzọ dị mma, m ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka ájá dị n’oké osimiri, bụ́ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’”+
8 M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt+ nakwa ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ n’ógbè ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt nakwa ndị Jibọs.+
7 M ga-akpọta unu n’ebe m nọ dị ka otu ndị,+ m ga-egosikwa na mụ onwe m bụ Chineke unu;+ unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu onye na-akpọpụta unu n’ibu arọ Ijipt.+