9 Ndị isi ìgwè otu narị otu narị+ ahụ wee mee ihe niile Jehoyada onye nchụàjà nyere ha n’iwu. Onye nke ọ bụla n’ime ha wee kpọrọ ndị ikom ya, bụ́ ndị na-abata n’ụbọchị izu ike,+ tinyere ndị na-apụ n’ụbọchị izu ike, wee bịakwute Jehoyada onye nchụàjà.