46 Ị ga-enyefekwa ha ụmụ gị ndị ga-anọchi gị dị ka ihe nketa ka ha bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Unu pụrụ iji ha mere ndị ọrụ, ma unu ejila obi ọjọọ zọda ụmụnne unu, bụ́ ụmụ Izrel, onye azọdala ibe ya.+
9 Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel Sọlọmọn ji mere ohu maka ịrụrụ ya ọrụ;+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha+ na ndị isi na-esote ndị isi agha ya na ndị isi nke ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya ya+ na ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya.+