6 Aịzaya wee sị ha: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa onyenwe unu, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Atụla egwu+ n’ihi okwu ị nụrụ, nke ndị na-ejere eze Asiria ozi kwuru iji kwutọọ m.+
15 O wee sị: “Geenụ ntị, Juda dum na unu ndị bi na Jeruselem, tinyere Eze Jehọshafat! Nke a bụ ihe Jehova gwara unu, ‘Unu atụla egwu,+ unu amakwala jijiji n’ihi nnukwu ìgwè mmadụ a; n’ihi na agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+
28 Unu atụkwala egwu+ ndị na-egbu ahụ́ ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi; kama na-atụnụ egwu+ onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.*+