19 ka ị gharakwa ileli anya n’eluigwe ma hụ anyanwụ na ọnwa na kpakpando, bụ́ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, e wee rafuo gị, i wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha,+ bụ́ ihe Jehova bụ́ Chineke gị kenyere ndị niile nọ n’okpuru eluigwe dum.+
16 Ha wee na-ahapụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke ha nyere n’iwu,+ ha wee meere onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ ụmụ ehi abụọ,+ meekwa ogwe osisi dị nsọ,+ ha wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe isiala,+ na-efekwa Bel ofufe;+