13 Ọ ga-erukwa na ozugbo ọbụ ụkwụ ndị nchụàjà, ndị bu igbe Jehova, bụ́ Onyenwe ụwa dum, zọsara mmiri Jọdan, a ga-egbochi mmiri Jọdan, bụ́ mmiri nke si n’ebe mgbago na-asọdata, ọ ga-eguzokwa otu ebe dị ka mmiri e gbochiri egbochi.”+
9 O wee ruo na mgbe ha gaara nkọnkọ nkọnkọ bute ya n’ebe ahụ, aka Jehova+ tinyere oké ọgba aghara n’obodo ahụ, o wee malite iti ndị obodo ahụ ihe otiti, malite n’onye nta ruo n’onye ukwu, ọkpụ ikè+ malitekwara ịpụta ha.