10 Toaị wee zipụ Joram nwa ya ka ọ gakwuru Devid wee jụọ ya otú o mere,+ jaakwa ya ike maka na o busoro Hadadiza agha wee gbuo ya (n’ihi na e nyere Hadadiza ọzụzụ ibuso Toaị agha); o jikwa ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee na ihe ndị e ji ọla kọpa mee jee.+