2 N’ihi na ha alụrụwo ụfọdụ n’ime ndị inyom ha, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom;+ ha onwe ha kwa, bụ́ mkpụrụ dị nsọ,+ na ndị ala a na-emekọkwa ihe,+ ọ bụkwa ndị isi na ndị osote onye na-achị achị bu omume ekwesịghị ntụkwasị obi a n’isi.”+
10 E mesịa, Ezra onye nchụàjà biliri wee sị ha: “Unu emewo omume ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihi na unu lụbatara ndị inyom mba ọzọ+ iji tụkwasị ihe n’ikpe ọmụma Izrel.+
14 Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,+ nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu?+ Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?+