14 Ọbụna ndị isi nchụàjà+ niile na mmadụ niile mere omume ekwesịghị ntụkwasị obi nke ukwuu, dị ka ihe arụ+ niile nke mba ndị ọzọ si dị, ha wee merụọ ụlọ Jehova, nke o doro nsọ na Jeruselem.+
19 ya bụ, ndị isi Juda na ndị isi Jeruselem,+ ndị na-eje ozi n’obí eze na ndị nchụàjà na ndị ala a niile bụ́ ndị si n’etiti anụ nwa ehi ahụ a bọwara abọwa gafere,