27 A ga-agụkwara ya unu dị ka onyinye unu, dị ka ọka nke si n’ebe nzọcha mkpụrụ+ nakwa dị ka ihe dị ukwuu e mepụtara n’ebe nzọchapụta mmanya ma ọ bụ n’ebe nzọchapụta mmanụ.
30 “Sịkwa ha, ‘Mgbe unu nyere ihe kasị mma n’ime ha n’onyinye,+ a ga-agụrụ ya ndị Livaị dị ka mkpụrụ nke ebe nzọcha mkpụrụ nakwa dị ka ihe e mepụtara n’ebe nzọchapụta mmanya ma ọ bụ mmanụ.