2 Ndị niile na-ejere eze ozi bụ́ ndị nọ n’ọnụ ụzọ ámá eze+ na-ehulata na-akpọrọ Heman isiala, n’ihi na ọ bụ ihe eze nyere n’iwu ka a na-emere ya. Ma Mọdekaị adịghị ehulata, ọ dịghịkwa akpọrọ ya isiala.+
14 Ziresh bụ́ nwunye ya na ndị enyi ya niile wee sị ya: “Ka ha rụọ osisi+ ogo ya dị iri kubit ise. E ruzie n’ụtụtụ+ gwa eze ka a kwụgbuo Mọdekaị n’elu ya.+ Jirizie ọṅụ soro eze gawa oriri ahụ.” Nke ahụ wee dị nnọọ mma n’anya+ Heman, o wee kwuo ka a rụọ osisi ahụ.+
3 N’ihi na Mọdekaị onye Juu na-esote+ Eze Ahazuirọs n’ọkwá, ọ dịkwa ukwuu n’etiti ndị Juu, ụmụnne ya kwadokwara ya n’ìgwè, ọ na-arụkwa ọrụ maka ọdịmma nke ndị ya ma na-agwa ụmụ ha niile okwu udo.+