13 ‘n’ihi na ndị m mere ihe abụọ dị njọ: Ha ahapụwo mụ onwe m,+ bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,+ ka ha wee gwuoro onwe ha olulu, olulu gbawara agbawa, ndị na-apụghị ichedo mmiri.’
28 N’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ,+ ọbụna dị ka ụfọdụ ndị na-ede abụ uri+ n’etiti unu kwuru, ‘N’ihi na anyị bụkwa ndị ọ mụrụ.’
11 “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto+ na nsọpụrụ+ na ike,+ n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile,+ ọ bụkwa n’ihi uche gị+ ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”+