17 Onye na-ewepụta ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya, na-akpọpụtakwa ndị agha na ndị dị ike n’otu mgbe ahụ:+ “Ha ga-edina ala.+ Ha agaghị ebili.+ A ga-emenyụ ha dị ka ọkụ.+ A ga-afụnyụ ha dị ka ọkụ a mụnyere n’owu oriọna.”+
4 N’ụbọchị ahụ,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-eme ka ịnyịnya+ ọ bụla nọrọ ná mgbagwoju anya, meekwa ka onye na-agba ya gbaa ara;+ m ga-eme ka anya m dị n’ebe Juda nọ,+ m ga-emekwa ka ịnyịnya niile nke ndị dị iche iche kpuo ìsì.