Job 36:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Lee! Chineke dị elu karịa otú anyị pụrụ ịmata;+A pụghịkwa ịchọpụta afọ ndụ ya.+ Abụ Ọma 90:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 N’ihi na otu puku afọ dị ka ụnyaahụ n’anya gị mgbe ọ gafeworo,+Dịkwa ka otu oge nche n’abalị.+ Malakaị 3:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 “N’ihi na abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.+ Unu onwe unu bụ ụmụ Jekọb; unu anwụchabeghị.+ Jems 1:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Ezi onyinye+ ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa,+ n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa,+ ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.+
17 Ezi onyinye+ ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa,+ n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa,+ ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.+