9 Ndị niile na-eme ihe oyiyi a pịrị apị bụ ihe efu,+ ihe ndị ahụ ha hụrụ n’anya agaghịkwa aba uru ọ bụla.+ Dịkwa ka ndị àmà ha, ha adịghị ahụ ihe ọ bụla, ha amaghịkwa ihe ọ bụla,+ ka ihere wee mee ndị na-eme ha.+
20 Ma ndị fọdụrụ n’ime ndị ahụ a na-ejighị ihe otiti ndị a gbuo echegharịghị n’ihe ha ji aka ha na-arụ,+ ka ha wee ghara ife ndị mmụọ ọjọọ+ na arụsị e ji ọlaedo na ọlaọcha+ na ọla kọpa na nkume na osisi mee, bụ́ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ ije ije;+