33 Jeenụ ije n’ụzọ+ niile Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu, ka unu wee dị ndụ, ka ihe wee gaziere unu,+ ka ụbọchị unu ga-ebi n’ala ahụ unu ga-enweta wee dịkwa ogologo.
23 Ma, ọ bụ iwu a ka m nyere ha, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru,+ m ga-abụ Chineke unu,+ unu ga-abụkwa ndị m; jeenụ ije n’ụzọ dum+ m ga-enye unu iwu ka unu soro, ka ihe wee gaziere unu.”’+
21 Onye nabatara ihe m nyere n’iwu ma na-edebe ha, ọ bụ onye ahụ hụrụ m n’anya.+ N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya, m ga-ahụkwa ya n’anya ma gosi ya onwe m nke ọma.”