Abụ Ọma 19:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ha bụ ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo, ee, karịa ọlaedo dị ukwuu a nụchara anụcha;+Ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ+ na mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-agụpụta.+ Abụ Ọma 119:72 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 72 Iwu+ si n’ọnụ gị dị m mma,+Karịa ọtụtụ puku ọlaedo na ọlaọcha.+ Ilu 3:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 n’ihi na ọ dị mma inweta ya dị ka uru karịa inweta ọlaọcha dị ka uru, inweta ya dị ka ihe mmadụ rụpụtara dịkwa mma karịa inweta ọlaedo.+ Ilu 8:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 N’ihi na amamihe dị mma karịa nkume kọral,+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ na-atọ ụtọ nke pụrụ ịha ka ya.+ Ilu 16:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Lee nnọọ ka inweta amamihe si dị mma karịa ọlaedo!+ A ga-ahọrọkwa inweta nghọta karịa ọlaọcha.+
10 Ha bụ ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo, ee, karịa ọlaedo dị ukwuu a nụchara anụcha;+Ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ+ na mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-agụpụta.+
14 n’ihi na ọ dị mma inweta ya dị ka uru karịa inweta ọlaọcha dị ka uru, inweta ya dị ka ihe mmadụ rụpụtara dịkwa mma karịa inweta ọlaedo.+
11 N’ihi na amamihe dị mma karịa nkume kọral,+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ na-atọ ụtọ nke pụrụ ịha ka ya.+