17 Chineke m, amaara m nke ọma na ị bụ onye na-enyocha obi,+ nakwa na ịkwụwa aka ọtọ na-atọ gị ụtọ.+ Mụ onwe m ji obi ziri ezi nye ihe ndị a niile n’afọ ofufo, obi dịkwa m ụtọ ịhụ ndị gị bịara ebe a ka ha na-enye gị onyinye n’afọ ofufo.
8 Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma.+ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi+ na ịhụ obiọma+ n’anya nakwa iji obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije?+