7 Ndị a akpafuwokwa n’ihi mmanya, ha awagharịwokwa n’ihi mmanya na-egbu egbu. Onye nchụàjà na onye amụma+ akpafuwo n’ihi mmanya na-egbu egbu, mmanya emegharịwo ha anya, ha awagharịwo+ n’ihi mmanya na-egbu egbu; ha akpafuwo n’ọhụụ ha, mmanya ekweghịzi ha mara ihe ha na-ekpe n’ikpe.