Abụ Ọma 141:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Jehova, biko, nyere m aka ka m chee ọnụ m nche;+Nyere m aka ka m chee egbugbere ọnụ m nche.+ Ilu 10:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị,+ ma onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.+ Ilu 12:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Njehie egbugbere ọnụ na-eme ka onye ọjọọ ma n’ọnyà,+ ma onye ezi omume na-esi n’ahụhụ apụta.+ Ilu 13:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Onye na-eche ọnụ ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya.+ Onye na-agbape ọnụ ekwu okwu—mbibi ga-abụ nke ya.+ Ekliziastis 10:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Akọchala eze+ ọbụna n’ime ụlọ ihi ụra gị, akọchakwala onye ọ bụla bara ọgaranya+ n’ime ime ụlọ gị bụ́ ebe ị na-edina; n’ihi na anụ ufe nke eluigwe ga-eme ka ọ nụ ya, ihe nwere nku ga-akọkwa ya.+
3 Onye na-eche ọnụ ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya.+ Onye na-agbape ọnụ ekwu okwu—mbibi ga-abụ nke ya.+
20 Akọchala eze+ ọbụna n’ime ụlọ ihi ụra gị, akọchakwala onye ọ bụla bara ọgaranya+ n’ime ime ụlọ gị bụ́ ebe ị na-edina; n’ihi na anụ ufe nke eluigwe ga-eme ka ọ nụ ya, ihe nwere nku ga-akọkwa ya.+