26 Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya na-efe Chineke+ n’ụzọ ziri ezi ma ọ dịghị achịkwa ire ya,+ kama na-aghọgbu obi ya,+ ụdị ofufe onye a na-efe bụ ihe efu.+
16 Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu,+ ndị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ, ndị na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha,+ ha na-etukwa ọnụ,+ ebe ha na-enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ+ n’ihi uru ha ga-erite.