Ilu 18:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ihe dị oké ọnụ ahịa nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike,+ ha dịkwa ka mgbidi nchebe n’echiche ya.+ Aịzaya 5:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe n’anya onwe ha na ndị nwere uche ọbụna n’anya onwe ha!+ Ndị Rom 12:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu;+ ka uche unu ghara ịdị n’ihe ndị dị elu,+ kama ka ihe ndị dị ala na-eduzi unu.+ Unu abụla ndị nwere uche n’anya onwe unu.+
16 Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu;+ ka uche unu ghara ịdị n’ihe ndị dị elu,+ kama ka ihe ndị dị ala na-eduzi unu.+ Unu abụla ndị nwere uche n’anya onwe unu.+