3 “Ndị nwere nghọta ga na-enwu dị ka ìhè mbara igwe;+ ndị na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị ezi omume ga na-enwukwa+ dị ka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.
14 Otú ọ dị, olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ?+ Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’ebe onye ha na-anụbeghị banyere ya nọ? Oleekwa otú ha ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-ekwusara ha?+
20 Ya mere, n’ebe ndị Juu nọ,+ adịrị m ka onye Juu, ka m wee rite ndị Juu n’uru; n’ebe ndị nọ n’okpuru iwu nọ, adịrị m ka onye nọ n’okpuru iwu,+ ọ bụ ezie na mụ onwe m anọghị n’okpuru iwu,+ ka m wee rite ndị nọ n’okpuru iwu n’uru.