Jenesis 20:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ebreham wee sị: “Ọ bụ n’ihi na m kwuru n’obi m, sị, ‘N’ezie, a dịghị atụ egwu Chineke n’ebe a,+ ha ga-egbu m n’ihi nwunye m.’+ Nehemaya 5:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 M wee gaa n’ihu ịsị: “Ihe unu na-eme adịghị mma.+ Ọ́ bụghị n’egwu+ Chineke anyị+ ka unu kwesịrị ije ije n’ihi nkọcha nke ndị mba ọzọ, bụ́ ndị iro anyị,+ na-akọcha anyị?+ Ilu 8:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ Ibuli onwe onye elu na nganga+ na ụzọ ọjọọ na ọnụ na-ekwu ihe rụrụ arụ+ ka m kpọrọ asị. Ilu 14:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Onye na-atụ egwu Jehova na-enwe ezi obi ike na ya,+ ụmụ ya ga-enwekwa ebe mgbaba.+ 2 Ndị Kọrịnt 7:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ya mere, ebe anyị nwere nkwa ndị a,+ ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ+ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ,+ wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.+
11 Ebreham wee sị: “Ọ bụ n’ihi na m kwuru n’obi m, sị, ‘N’ezie, a dịghị atụ egwu Chineke n’ebe a,+ ha ga-egbu m n’ihi nwunye m.’+
9 M wee gaa n’ihu ịsị: “Ihe unu na-eme adịghị mma.+ Ọ́ bụghị n’egwu+ Chineke anyị+ ka unu kwesịrị ije ije n’ihi nkọcha nke ndị mba ọzọ, bụ́ ndị iro anyị,+ na-akọcha anyị?+
13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ Ibuli onwe onye elu na nganga+ na ụzọ ọjọọ na ọnụ na-ekwu ihe rụrụ arụ+ ka m kpọrọ asị.
7 Ya mere, ebe anyị nwere nkwa ndị a,+ ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ+ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ,+ wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.+