11 Ndị Beria nwere ezi obi karịa ndị bi na Tesalonaịka, n’ihi na ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha+ Akwụkwọ Nsọ+ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.+
16 Kwenụ ka okwu nke Kraịst biri n’ime unu n’ụba, ka o meekwa ka unu nwee amamihe niile.+ Jirinụ abụ ọma+ na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ+ na amara na-ezi ibe unu ihe,+ na-adụkwa ibe unu ọdụ, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.+