Abụ Ọma 25:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya,+Ọ bụkwa ya na ha na-agba ndụ, iji mee ka ha mara ọgbụgba ndụ ya.+ Abụ Ọma 34:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Tụọnụ egwu Jehova, unu ndị nsọ ya,+N’ihi na ọ dịghị ihe kọrọ ndị na-atụ egwu ya.+ Abụ Ọma 103:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere+Dị ka nna si emere ụmụ ya ebere.+ Ilu 23:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Ka obi gị ghara inwere ndị mmehie anyaụfụ,+ kama na-atụ egwu Jehova ogologo ụbọchị dum.+
14 Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya,+Ọ bụkwa ya na ha na-agba ndụ, iji mee ka ha mara ọgbụgba ndụ ya.+