5 A ga-esikwa otú ahụ yiwe onye meriri emeri+ uwe elu nke na-acha ọcha;+ m gaghịkwa ehichapụ aha ya ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwupụta aha ya n’ihu Nna m+ na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.+
14 M wee sị ya ozugbo: “Onyenwe m, ọ bụ gị onwe gị maara.” O wee sị m: “Ndị a bụ ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta,+ ha asawokwa uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha+ n’ime ọbara+ Nwa Atụrụ ahụ.