34 ọ bụkwa onye e kewara ekewa. Nwaanyị na-alụghị di, nke bụkwa nwaanyị na-amaghị nwoke, na-echegbu onwe ya maka ihe Onyenwe anyị,+ ka o wee dị nsọ ma n’ahụ́ ya ma ná mmụọ ya. Otú ọ dị, nwaanyị lụrụ di na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa, otú ọ pụrụ isi mee ihe dị di ya mma.+