44 Ha ga-akụtu gị na ụmụ gị bụ́ ndị nọ n’ime gị n’ala,+ ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya+ n’ime gị, n’ihi na ị ghọtaghị oge e ji eleta gị.”+
31 N’ihi na o wepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe+ elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtara, o nyewokwa mmadụ niile ihe ga-emesi ha obi ike, ebe ọ bụ na o mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”+