7 “Ụbọchị a ga-elebara ha anya ga-abịa;+ ụbọchị a ga-akwụ ha ụgwọ kwesịrị ha ga-abịa.+ Ndị Izrel ga-amata ihe na-emenụ.+ Onye amụma ga-aghọ onye nzuzu,+ ọtụtụ njehie gị+ na ibu iro nke juru ebe niile ga-eme ka ara gbaa onye mmụọ na-akpali ikwu okwu.”
4 Onye kasị mma n’ime ha yiri ahịhịa ogwu, onye kasị bụrụ onye ziri ezi n’ime ha dị njọ karịa ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige.+ Ụbọchị ndị nche gị, mgbe a ga-elebara gị anya, ga-abịa.+ Ugbu a ka ha ga-anọ ná mgbagwoju anya.+
12 Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ,+ ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto n’ụbọchị nleta+ ya n’ihi ọrụ ọma+ unu nke ha ji anya ha na-ahụ.