4 Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+
42 O nyekwara anyị iwu ikwusara ndị mmadụ ozi ọma+ na ịgba àmà nke ọma na onye a bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.+