27 Nna m enyefewo m ihe niile n’aka,+ ọ dịghịkwa onye maara Ọkpara ahụ n’ụzọ zuru ezu ma e wezụga Nna ya,+ ọ dịghịkwa onye maara Nna m n’ụzọ zuru ezu ma e wezụga Ọkpara ya na onye ọ bụla Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.+
42 O nyekwara anyị iwu ikwusara ndị mmadụ ozi ọma+ na ịgba àmà nke ọma na onye a bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.+
31 N’ihi na o wepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe+ elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtara, o nyewokwa mmadụ niile ihe ga-emesi ha obi ike, ebe ọ bụ na o mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”+
10 N’ihi na a ghaghị ime ka anyị niile pụta ìhè n’ihu oche ikpe Kraịst,+ ka onye ọ bụla wee nweta ụgwọ ọrụ ya maka ihe ndị o ji ahụ́ ya mee, dị ka ihe ndị o mere si dị, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+
4Ana m enyesi gị iwu ike n’ihu Chineke na Kraịst Jizọs, bụ́ onye a kara aka ikpe+ ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ+ ikpe, site ná mpụta ìhè+ ya nakwa alaeze ya,+