2 Timoti
4 Ana m enyesi gị iwu ike n’ihu Chineke na Kraịst Jizọs, bụ́ onye a kara aka ikpe+ ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ+ ikpe, site ná mpụta ìhè+ ya nakwa alaeze ya,+ 2 kwusaa okwu Chineke,+ jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya n’oge dị mma,+ n’oge nsogbu,+ jiri ogologo ntachi obi+ niile na nkà izi ihe dọọ aka ná ntị,+ baa mba, gbaakwa ndị mmadụ ume. 3 N’ihi na a ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anabata ozizi ahụ na-enye ezi ndụ,+ kama, dị ka ha si chọọ, ha ga-akpọkọtara onwe ha ndị ozizi ka ha wee na-anụ ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị;+ 4 ha ga-ewepụkwa ntị ha ka ha ghara ịnụ eziokwu ahụ, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gewe akụkọ ụgha.+ 5 Ma, gị onwe gị, nwee uche ziri ezi+ n’ihe niile, hụjuo anya,+ rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma,+ jezuo ozi gị.+
6 N’ihi na a malitelarị ịwụpụ m dị ka àjà ihe ọṅụṅụ,+ oge a kara aka a ga-atọhapụ+ m dịkwa nso. 7 Alụwo m ezi ọgụ ahụ,+ agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi,+ edebewo m okwukwe ahụ.+ 8 Malite ugbu a gaa n’ihu, e debeere m okpueze ezi omume,+ nke Onyenwe anyị, bụ́ onyeikpe ezi omume,+ ga-enye m dị ka ụgwọ ọrụ+ n’ụbọchị ahụ,+ ma ọ bụghị naanị m, kamakwa ndị niile na-atụsi anya ike ka ọ pụta ìhè.
9 Gbalịsie ike ka ị bịakwute m n’oge na-adịghị anya.+ 10 N’ihi na Dimas+ agbahapụwo m n’ihi na ọ hụrụ usoro ihe dị ugbu a n’anya,+ ọ gawokwa Tesalonaịka; Kresens agaa Galeshia,+ Taịtọs agaa Dalmeshia. 11 Ọ bụ naanị Luk ka mụ na ya nọ. Kpọrọ Mak ka gị na ya bịa, n’ihi na ọ baara m uru+ maka ije ozi. 12 Ma ezipụwo m Tikikọs+ ka ọ gaa Efesọs. 13 Ị bịawa, weta uwe mgbokwasị ahụ m hapụrụ na Troas+ n’aka Kapọs, wetakwa akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịsịa, akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe.
14 Alegzanda+ onye na-akpụ ọla kọpa mere m ọtụtụ ihe ọjọọ—Jehova ga-akwụ ya ụgwọ dị ka ihe ndị o mere si dị+— 15 gị onwe gị kwa, kpachara anya n’ebe ọ nọ, n’ihi na o guzogidere okwu anyị gabiga ókè.
16 Mgbe m na-azara ọnụ m na nke mbụ ya, ọ dịghị onye dịnyeere m, kama ha niile malitere ịgbahapụ m+—ya esola n’ihe a ga-agụkọrọ ha+— 17 ma Onyenwe anyị guzoro m nso+ ma nye m ike,+ ka e wee site n’aka m kwusaa ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu, ka mba niile wee nụkwa ya;+ a napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.+ 18 Onyenwe anyị ga-anapụta m n’ajọ ọrụ niile,+ ọ ga-azọpụtakwa m maka alaeze eluigwe ya.+ Ka otuto dịrị ya ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
19 Keleere m Priska+ na Akwịla nakwa ezinụlọ Onesịfọrọs.+
20 Erastọs+ nọgidere na Kọrịnt,+ ma m hapụrụ Trọfimọs+ n’ọrịa na Maịlitọs.+ 21 Gbalịsie ike ka ị bịarute tupu oge oyi.
Yubulọs na-ekele gị, Pudens na Laịnọs na Klọdia na ụmụnna niile na-ekelekwa gị.
22 Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ ị na-egosi.+ Ka obiọma ya na-erughịrị mmadụ dịnyere unu.