15 Mmụọ ozi nke asaa wee fụọ opi ya.+ Oké olu wee kwuo okwu n’eluigwe, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị+ na nke Kraịst ya,+ ọ ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”+
“Nzọpụta+ na ike+ na alaeze nke Chineke+ anyị na ikike nke Kraịst+ ya amalitewo ugbu a, n’ihi na a chụdawo onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke+ anyị ehihie na abalị!