56 N’ihi na onye na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-abịakwasị Babịlọn,+ a ga-ejidekwa ndị dike ya.+ A ga-agbajisị ụta ha,+ n’ihi na Jehova bụ Chineke nke na-akwụ ụgwọ.+ Ọ ghaghị ịkwụ ya ụgwọ.+
10 Ha wee jiri oké olu tie mkpu, sị: “Ọkaakaa+ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu,+ ruo ole mgbe ka ị ga-ahapụ ikpe ikpe+ na ịbọ ọbọ ọbara anyị+ n’isi ndị bi n’elu ụwa?”