20 Dị ka a na-achịkọta ọlaọcha na ọla kọpa na ígwè+ na opu na gbamgbam wụba n’ime oké ọkụ, iji fụọ+ ha ọkụ ka ha gbazee,+ otú ahụ ka m ga-esi chịkọta ha n’iwe m nakwa n’ọnụma m, m ga-afụ unu ọkụ wee gbazee unu.
2 “Ma ònye pụrụ idi ụbọchị ọ ga-abịa,+ ònye pụkwara iguzo mgbe ọ ga-apụta?+ N’ihi na ọ ga-adị ka ọkụ nke onye na-anụcha ihe,+ dịkwa ka ncha+ nke ndị na-asụ ákwà.+
12 O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka, ọ ga-edebekwa ebe nzọcha mkpụrụ ya ọcha nke ọma, ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit ya n’ime ụlọ nkwakọba ihe,+ ma ọ ga-esu igbogbo ya ọkụ+ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”