8 Onye na-ekwupụta na m bụ onye ezi omume nọ nso.+ Ònye pụrụ ịlụso m ọgụ? Ya bịa ka mụ na ya guzoro.+ Ònye nwere okwu ikpe megide m?+ Ya bịaruo m nso.+
2 Nụrụnụ okwu ikpe Jehova, unu ugwu niile, nụrụkwanụ, unu ihe ndị na-adịte anya, unu ntọala ụwa;+ n’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu ikpe, ọ bụkwa ya na Izrel ga-arụrịta ụka:+