28 Onye na-ekwu banyere Saịrọs,+ sị, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-eme ihe niile na-atọ m ụtọ;+ ọ ga-eme ọbụna ihe m kwuru banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ewughachi ya,’ na ihe m kwuru banyere ụlọ nsọ ya, sị, ‘A ga-atọ ntọala gị.’”+
45Nke a bụ ihe Jehova gwara onye o tere mmanụ,+ bụ́ Saịrọs, onye m seere n’aka nri ya,+ ka m wee zọda mba dị iche iche n’ihu ya,+ ka m wee tọpụ ndị eze ihe ha kere n’úkwù; ka m wee megheere ya ọnụ ụzọ nwere ibo abụọ, ka a ghara imechi ọbụna ọnụ ụzọ ámá ya emechi:
28 Kwadebe mba dị iche iche, tinyere ndị eze Midia,+ ndị gọvanọ ya, na ndị ya niile na-esote onye na-achị achị na ala dum onye nke ọ bụla na-achị, ka ha buso ya agha.