26 Onye na-eme ka okwu ohu ya mezuo, Onye na-emezucha atụmatụ nke ndị ozi ya;+ Onye na-ekwu banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ebi na ya,’+ kwuokwa banyere obodo ndị dị na Juda, sị, ‘A ga-ewughachi ha,+ m ga-ewu ebe ya niile tọgbọrọ n’efu’;+
4 Ha ga-ewughachi ebe e bibiri ebibi ndị dịwara kemgbe ogologo oge;+ ha ga-ewu ọbụna ebe ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu n’oge ochie.+ Ha ga-eme ka obodo ndị e bibiri ebibi dị ọhụrụ,+ bụ́ obodo ndị tọgbọrọ n’efu malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.