Abụ Ọma 40:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 I mewo ọtụtụ ihe,+Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị;+Ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.+Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha,Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.+ Ekliziastis 7:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Ihe dị adị dị anya, dịkwa oké omimi. Ònye pụrụ ịchọpụta ya?+ Ndị Rom 11:34 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 34 N’ihi na “ònye maara uche Jehova,+ ma ọ bụ, ònye bụ onye ndụmọdụ ya?”+
5 I mewo ọtụtụ ihe,+Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị;+Ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.+Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha,Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.+