-
Nehemaya 13:15Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
15 N’ụbọchị ndị ahụ, ahụrụ m ndị na-azọchapụta mmanya n’ụbọchị izu ike+ na Juda, ndị na-ebubatakwa ikpo ọka, na-ebukwasịkwa+ ha n’elu ịnyịnya ibu,+ tinyere mmanya, mkpụrụ vaịn na mkpụrụ fig+ na ụdị ibu niile, wee na-ebubata ha na Jeruselem n’ụbọchị izu ike;+ m wee gbaa àmà megide ha n’ụbọchị ha rere ihe oriri.
-
-
Aịzaya 58:13Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
13 “Ọ bụrụ na i kworo ụbọchị izu ike mee ka ụkwụ gị laghachi azụ, i wee kwụsị ime ihe na-atọ gị ụtọ n’ụbọchị m nke dị nsọ,+ kpọọkwa ụbọchị izu ike ihe na-enye obi ụtọ, ụbọchị Jehova nke dị nsọ, nke a na-akwanyere ùgwù,+ i wee kwanyere ya ùgwù kama ịgbaso ụzọ gị, kama ịchọ ihe na-atọ gị ụtọ na okwu na-enweghị isi;
-