13 Izrel dum ga-akwara ya ákwá arịrị+ ma lie ya, n’ihi na n’ime ndị ezinụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị onye a ga-aba n’ebe ili ozu; n’ihi na Jehova bụ́ Chineke Izrel ahụwo ihe dị mma n’ime ya n’ụlọ Jeroboam.+
20 “Ya mere, lee, m ga-eme ka e lie+ gị dị ka e liri nna nna gị hà, a ga-elikwa gị n’ili gị n’udo,+ anya gị agaghịkwa ahụ ọdachi dum m ga-eme ka ọ dakwasị obodo a.”’” Ha wee gwa eze ihe ha jetara.