52Teta, teta, yiri ike gị dị ka uwe,+ gị Zayọn! Yiri uwe gị mara mma,+ gị Jeruselem, bụ́ obodo nsọ!+ N’ihi na onye a na-ebighị úgwù na onye na-adịghị ọcha agaghị abata n’ime gị ọzọ.+
2 Ahụkwara m obodo nsọ ahụ,+ bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ka o si n’eluigwe,+ n’ebe Chineke nọ, na-agbadata. A kwadebekwara ya dị ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ nke a chọrọ mma maka di ya.+