Abụ Nrịgo.
132 Jehova, biko, cheta mweda niile+
E wedara Devid+ n’ala;
2 Otú o si ṅụọrọ Jehova iyi,+
Otú o si kwe Dike+ nke Jekọb nkwa, sị:+
3 “Agaghị m abanye n’ụlọikwuu bụ́ ụlọ m.+
Agaghị m arịgoro n’ihe ndina bụ́ nnukwu ihe ndina m,+
4 Agaghị m ekwe ka ụra gaa m n’anya,+
Agaghịkwa m ekwe ka anya m nke na-enwu gbaa roo ụra,+
5 Ruo mgbe m chọtaara Jehova otu ebe,+
Mgbe m chọtaara Dike nke Jekọb nnukwu ụlọikwuu.”+
6 Lee! Anyị anụwo ya n’Efrata,+
Anyị ahụwo ya n’oké ọhịa.+
7 Ka anyị bata n’ụlọikwuu ya dị ebube;+
Ka anyị kpọọ isiala n’ebe mgbakwasị ụkwụ ya.+
8 Jehova, biko, bilie baa n’ebe izu ike gị,+
Gị na Igbe+ nke ike gị.+
9 Ka ndị nchụàjà gị yiri ezi omume dị ka uwe,+
Ka ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ tiekwa mkpu ọṅụ.+
10 Ajụla ige onye i tere mmanụ ntị,+
N’ihi Devid bụ́ ohu gị.+
11 Jehova aṅụworo Devid iyi,+
N’ezie, ọ gaghị ahapụ imezu ya:+
“M ga-eme ka mkpụrụ nke afọ gị+
Nọkwasị n’ocheeze gị.+
12 Ọ bụrụ na ụmụ gị edebe ọgbụgba ndụ m+
Na ihe ncheta m ga-akụziri ha,+
Ụmụ ha kwa ga-anọkwasị n’ocheeze gị+
Ruo mgbe ebighị ebi.”+
13 N’ihi na Jehova ahọrọwo Zayọn;+
Ọ gụsiwo ya agụụ ike ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ọ sịrị:+
14 “Nke a bụ ebe izu ike m ruo mgbe ebighị ebi;+
N’ebe a ka m ga-ebi, n’ihi na ọ gụsiwo m agụụ ike.+
15 Aghaghị m ịgọzi ihe oriri ya.+
M ga-emekwa ka ihe oriri ju ndị ogbenye bi n’ime ya afọ.+
16 M ga-eyiwe ndị nchụàjà ya nzọpụta dị ka uwe;+
Ndị ya na-eguzosi ike n’ihe aghaghịkwa iti mkpu ọṅụ.
17 M ga-eme ka mpi Devid pulite n’ebe ahụ.+
Edoworo m onye m tere mmanụ oriọna n’usoro.+
18 M ga-eyiwe ndị iro ya ihere dị ka uwe;+
Ma okpueze ya+ ga-enwe ihe ịga nke ọma.”+