25 Ọ bụ ya mere Jehova ji na-eweso ndị ya iwe dị ọkụ, ọ ga-esetịkwa aka ya mee ha ihe wee gbuo ha.+ Ugwu ga-ama jijiji,+ ozu ha ga-adịkwa ka ihe e kpofuru ekpofu n’etiti okporo ámá.+
N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.
4 ma ọ́ bụghị mmadụ ihuru ala n’etiti ndị mkpọrọ, ndị mmadụ ana-adakwa n’etiti ndị e gburu egbu?+ N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.+