Ilu 15:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ụzọ onye ajọ omume bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma onye na-achụso ezi omume ka ọ hụrụ n’anya.+ Ilu 21:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Àjà ndị ajọ omume bụ ihe arụ,+ ma ya fọdụzie mgbe mmadụ na-eweta ya ma na-eme omume rụrụ arụ.+ Ezikiel 8:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ndị ikom iri asaa+ n’ime ndị okenye ụlọ Izrel, ha na Jeazanaya nwa Shefan,+ guzo n’ihu ihe ndị ahụ, onye nke ọ bụla jikwa ihe e ji etinye ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’aka ya, ísì ụtọ nke ihe nsure ọkụ ahụ nọkwa na-arịgo.+
11 Ndị ikom iri asaa+ n’ime ndị okenye ụlọ Izrel, ha na Jeazanaya nwa Shefan,+ guzo n’ihu ihe ndị ahụ, onye nke ọ bụla jikwa ihe e ji etinye ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’aka ya, ísì ụtọ nke ihe nsure ọkụ ahụ nọkwa na-arịgo.+