27 Ozugbo ahụ, Mozis setịrị aka ya n’elu oké osimiri ahụ, oké osimiri ahụ wee malite ịlọghachi n’ọnọdụ ya n’isi ụtụtụ. Ka nke a na-eme, ndị Ijipt nọ na-agbapụ ka ọ ghara izute ha, ma Jehova tụbara ndị Ijipt n’etiti oké osimiri ahụ.+
11 I kewakwara+ oké osimiri n’ihu ha, ha wee jee ije n’ala akọrọ mgbe ha si n’etiti oké osimiri ahụ gafee;+ ị tụbakwara ndị na-achụ ha n’oké osimiri+ dị ka nkume+ a tụbara na mmiri dị ike.+