17 bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ,+ nke ụwa na-apụghị inweta,+ n’ihi na ọ dịghị ahụ ya, ọ maghịkwa ya. Unu maara ya, n’ihi na ọ na-adịgide n’ebe unu nọ, ọ dịkwa n’ime unu.+
13 Otú ọ dị, mgbe ihe inyeaka ahụ bịarutere, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ,+ ọ ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile, n’ihi na ọ gaghị ekwu ihe si n’echiche ya, kama ihe ndị ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akọkwara unu ihe ndị na-abịanụ.+