13 Tie mkpu ọṅụ, gị eluigwe,+ ṅụrịa ọṅụ, gị ụwa.+ Ka ugwu niile tie mkpu ọṅụ.+ N’ihi na Jehova akasiwo ndị ya obi,+ ọ na-emere ndị ya ọ na-enweghị ka ọ hà ha ọmịiko.+
11 “‘“‘Ma mba nke ga-anyara yok eze Babịlọn n’olu wee jeere ya ozi, m ga-eme ka o zuru ike n’ala ya,’ ka Jehova kwuru, ‘ọ ga-akọkwa ihe na ya, birikwa na ya.’”’”+